Isaiah 40

Nkasiobi dịrị ndị Chineke

1Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi,
ka Chineke gị kwuru.
2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu,
gwa ya;
na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla,
na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile,
na o sitela nʼaka Onyenwe anyị
nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile.

3Otu onye na-eti mkpu sị,
“Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị
nʼime ọzara,
meenụ ka ụzọ atụliri atụli
guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị.
4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu,
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala,
ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem,
meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị.
5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị,
mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu.
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.”

6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!”
Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?”

“Mmadụ niile dị ka ahịhịa,
ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa.
7Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
Otu a ka ọ dịrị mmadụ.

nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya.
Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.
8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa,
ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.”

9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn,
rigoro nʼelu ugwu;
gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem,
welie olu gị elu tisie mkpu ike;
e, tisie mkpu ike, atụla egwu.
Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha:
“Chineke unu na-abịa.”
10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike,
ike aka ya ka o ji achị.
Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,
ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ.
Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.

12Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri?
Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe?
Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu?
Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu?
Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
13Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị,
maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
14Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe,
ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma?
Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma,
maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?

15Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere;
a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe;
ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ.
16Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja.
Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya;
ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru,
dịka ihe na-erughị ihe efu.

18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke?
Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ,
nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya,
ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
20Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a
na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure.
Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma,
onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada.

21Ọ bụ na unu amaghị?
Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya?
Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite?
Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
22Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu.
Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana.
Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa,
were ya mere ebe obibi ya.
23Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa,
mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
24Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute.
Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute,
mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala,
mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha,
bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.

25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m?
Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.
26Lee anya nʼeluigwe;
onye kere kpakpando ndị a niile?
Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?
Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?
Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,
ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.

27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb?
Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị,
“Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị,
Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
28Ọ bụ na ị matabeghị?
Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya?
Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,
Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.
Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.
O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike,
na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
30Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.
E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
31ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Copyright information for IboBIU